Psalms 69

Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Eji olu abụ “Okoko Lili.” Abụ Devid.

Ekpere maka nnapụta

1O Chineke, zọpụta m,
nʼihi na mmiri abịaruola m nʼolu.
2Ana m emikpu nʼụrụrọ ebe dị omimi,
e nwekwaghị ebe ịzọkwasị ụkwụ dị.
Abịala m nʼebe mmiri dị omimi;
uju mmiri na-achọkwa ikpuchigide m.
3Akpịrị akpọọla m nkụ;
ike agwụla m ebe m na-akpọ oku maka enyemaka.
Anya m agbaala ọchịchịrị
ebe m na-ele anya Chineke.
4Ndị kpọrọ m asị nʼefu dị ukwuu
karịa agịrị isi dị m nʼisi.
Ndị na-achọ ịla ndụ m nʼiyi dị ukwuu,
bụ ndị họọrọ ịbụ ndị iro m, mgbe ọ na-adịghị ihe ọbụla m mere ha.
Ha nọgidesịrị m ike mee ka m nyeghachi
ihe m na-ezughị nʼohi.

5Gị, Chineke, ị maara enweghị uche m niile;
ikpe ọmụma m abụghị ihe zoro ezo nʼihu gị.

6Ekwela ka ihere mee ndị
na-atụkwasị gị obi nʼihi m,
O Onyenwe m, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile;
ka ndị na-achọ gị
ghara ịbụ ndị a ga-eme ihe ihere nʼihi m,
O Chineke nke Izrel.
7Ọ bụ nʼihi gị ka m na-anagide ịkwa emo,
ihere ekpuchiela m ihu.
8Abụ m ọbịa nʼebe ụmụnna m nọ,
nʼebe ụmụnne nọ, abụ m onye mba ọzọ.
9Nʼihi na ihe gbasara ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi,
ịta ụta niile nke ndị na-akparị gị adakwasịla m.
10Mgbe m na-ebe akwa na-ebukwa ọnụ,
ha kparịrị m nʼihi na m na-eme nke a.
11Mgbe m yikwasịrị uwe iru ụjụ m,
a ghọrọ m ihe ha ji eme ihe ọchị.
12Ndị na-anọ ọnọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama, na-akwa m emo, na-akọ m ọnụ,
abụ m isi abụ nke ndị na-aṅụbiga mmanya oke na-abụ.

13O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị nʼekpere,
nʼoge ihuọma gị;
na oke ịhụnanya gị, O Chineke m,
zaa m nʼeziokwu nke nzọpụta gị.
14Dọpụta m site nʼụrụrọ,
ekwela ka m mikpuo;
zọpụta m site nʼaka ndị kpọrọ m asị,
site na mmiri miri emi.
15Ekwela ka uju mmiri kpuchie m,
maọbụ ka ebe dị omimi loda m,
ma ọ bụkwanụ ka olulu lomie m, kpuchie m nʼime ọnụ ya.

16O Onyenwe anyị, zaa m, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị,
nʼime ịdị ukwuu nke oke ebere gị, chee m ihu.
17Ezonarịla mụ bụ ohu gị ihu gị.
Anọ m na nsogbu, mee ngwangwa zaa m!
18Bịa m nso zọpụta m.
Gbapụta m site nʼaka ndị iro m.

19Ị maara ihe niile banyere ihe ọchị ha ji m mee, mweda nʼala m na ihe ihere:
ndị iro m niile nọkwa gị nʼihu.
20Ọchị ha na-achị m etiwaala m obi,
ma hapụ m nʼọnọdụ enweghị inyeaka.
Elere m anya onye ga-emere m ebere, ma ọ dịghị onye ọbụla m hụrụ;
lee anya ndị ga-akasị m obi, ma ọ dịkwaghị onye m chọtara.
21Ha tinyere oluilu nʼime nri m,
nyekwa m mmanya gbara ụka ka m ṅụọ.

22Ka tebul e debere nʼihu ha ghọrọ ha ọnya;
ka ọ bụrụ ha ihe ịbọ ọbọ mgbe ha nọ nʼudo ya ghọrọ ha ọnya igbudu.
23Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha gharakwa ịhụ ụzọ ọzọ,
mekwa ka ụkwụ ha na-ama jijiji mgbe niile.
24Wụkwasị ha oke iwe gị,
ka iwe gị dị ọkụ zute ha.
25Ka ebe obibi ha tọgbọrọ nʼefu,
ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ụlọ ikwu ha.
26Ha na-akpagbu ndị ahụ i merụrụ ahụ,
na-ekwukwa banyere ihe mgbu ndị ahụ i kwohịara ahụ.
27Boo ha ebubo ajọ omume tụkwasị nʼelu ajọ omume,
ekwekwala ka ha keta oke na ezi omume
Maọbụ, nzọpụta
gị.
28Mee ka e hichapụ aha ha site nʼakwụkwọ nke ndụ,
ka a hapụ idekọta aha ha na nke ndị ezi omume.

29Anọ m nʼụfụ na ihe mgbu,
O Chineke, mee ka nzọpụta gị kpuchie m.

30Aga m eji ịbụ abụ too aha Chineke,
jirikwa ekele bulie ya elu.
31Nke a ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ karịa oke ehi,
karịa oke ehi, nke mpi ya na ụkwụ ya ka dị.
32Ndị ogbenye ga-ahụ ya ma ṅụrịakwa ọṅụ;
unu ndị na-achọ Chineke, ka obi unu na-adị ndụ.
33 Onyenwe anyị na-anụ ekpere ndị nọ na mkpa,
ọ naghị eledakwa ndị ya a dọtara nʼagha anya.

34Ka eluigwe na ụwa too ya,
osimiri niile na ihe niile bi nʼime ha.
35Nʼihi na Chineke ga-azọpụta Zayọn;
ọ ga-ewugharị obodo niile nke Juda.
Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ebi nʼime ya, mee ya ihe nweta ha.
36Ụmụ ndị na-ejere ya ozi ga-eketa ya,
ndị hụrụ aha ya nʼanya ga-ebikwa ebe ahụ nʼime ya.
Copyright information for IboBIU